Psalms 136

Abụ ekele

1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,

ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,

nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
20Na Ọg eze Bashan,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
21Were ala ha nye dịka ihe nketa,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.

Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU